30Ma i sitere na ntachiobi gị nye ha ogologo oge ichegharị; ị dọrọ ha aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. Ya mere, i kwenyekwara ka ndị iro ha merie ha ọzọ.
31Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.
32“Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa.
33Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.
34Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.