33Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.
34Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.
35Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
36“Ma lee, anyị bụ ndị ohu taa, e, anyị bụ ndị ohu nʼala ahụ i nyere nna nna anyị ha, ka ọ bụrụ ebe ha ga-esi rie mkpụrụ ọ mịpụtara na ihe ọma ọ na-amịpụta.
37Nʼihi mmehie anyị, mkpụrụ ọma niile a na-esi na ya wepụta ka ndị eze ahụ niile i mere ka ha na-achị anyị na-ewere. Ha nwere ike nʼahụ anyị, na nʼebe anụ ụlọ anyị dị ka o si dị ha mma. Anyị na-ahụjukwa anya.