Ọnụọgụgụ 1

Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

Numbers 1:20 (UKJV) And the children of Reuben, Israel's eldest son, by their generations, after their families, by the house of their fathers, according to the number of the names, by their polls, every male from twenty years old and upward, all that were able to go forth to war;

18Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,

19dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.

20Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

21Ọnụọgụgụ ndị niile si nʼebo Ruben dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).

22Site nʼụmụ Simiọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.