24Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
25Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai.
26Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
27Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
28Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.