7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.
8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
10Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
11ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.