1Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile.
2Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a.
3Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”