Ọnụọgụgụ 14

‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’

Numbers 14:16 (UKJV) Because the LORD was not able to bring this people into the land which he swore unto them, therefore he has slain them in the wilderness.

14Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị Onyenwe anyị, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ Onyenwe anyị na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị Onyenwe anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị.

15Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị,

16‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’

17“Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo.

18Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.