24Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya.
25Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.”
26Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
27“Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a.
28Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m.