28Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m.
29Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m.
30O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.
31Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya.
32Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a.