39Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile Onyenwe anyị nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu.
40Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu.
41Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”