Ọnụọgụgụ 16

Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.

Numbers 16:42 (UKJV) And it came to pass, when the congregation was gathered against Moses and against Aaron, that they looked toward the tabernacle of the congregation: and, behold, the cloud covered it, and the glory of the LORD appeared.

40dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.

41Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”

42Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.

43Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.

44Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.