Ọnụọgụgụ 19

Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị.

Numbers 19:12 (UKJV) He shall purify himself with it on the third day, and on the seventh day he shall be clean: but if he purify not himself the third day, then the seventh day he shall not be clean.

10Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

11“Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.

12Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị.

13Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ Onyenwe anyị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha.

14“Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.