6Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.
7Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
8Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị.
9“Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie.
10Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.