1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
2“Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
3Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.