10Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
11Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
12Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
13Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
14Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.