3Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
4Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600)
5Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
6Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
7Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.