7Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
8Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
9Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
10Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
11Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).