10Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
11Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
12Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
13A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
14Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị.