5Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
6Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.
7Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
8“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
9Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.