32Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
33Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei.
34Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.”
35Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.