1Ndị Izrel biliri njem bịarute nʼobosara ala Moab. Manye ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Jọdan ebe chere ihu nʼobodo Jeriko.
2Ma Balak nwa Zipoa ahụlarị ihe niile Izrel mere ndị Amọrait.
3Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel.