12Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”
13Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na Onyenwe anyị ekweghị ka m soro unu.”
14Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.”
15Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.
16Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m.