Ọnụọgụgụ 22

Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.

Numbers 22:25 (UKJV) And when the ass saw the angel of the LORD, she thrust herself unto the wall, and crushed Balaam's foot against the wall: and he stroke her again.

23Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.

24Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.

25Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.

26Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.

27Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.