29Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.”
30Ịnyịnya ibu ahụ gwara Balam okwu ọzọ sị ya, “Ọ bụ na mụ onwe m abụghị ịnyịnya ibu gị nke ị na-anọ nʼelu ya ogologo oge ndị a niile? Ọ dịla mgbe m si otu a meso gị omume nʼime ndụ m niile?” Belam zara sị ya, “Ee.”
31Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.
32Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe ugboro atọ? Abịara m igbochi gị ka ịla nʼiyi dị na-eche gị ghara irute gị.
33Ugboro atọ ka ịnyịnya ibu a hụrụ m, ma site nʼihu m wezuga onwe ya. A sị na ọ bụghị ntụgharị ọ tụgharịrị site nʼebe m nọ, nʼezie, ugbu a, a gara m egbu gị ma hapụ ịnyịnya ibu gị ndụ.”