Ọnụọgụgụ 22

zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị, “Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m.

Numbers 22:5 (UKJV) He sent messengers therefore unto Balaam the son of Beor to Pethor, which is by the river of the land of the children of his people, to call him, saying, Behold, there is a people come out from Egypt: behold, they cover the face of the earth, and they abide opposite to me:

3Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel.

4Ndị Moab jekwuru ndị okenye Midia sị ha, “Igwe mmadụ ndị a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu. Ha ga-eripịa ha dịka ehi si erichapụ ahịhịa ndụ dị nʼala.” Ya mere, Balak nwa Zipoa, onye bụ eze ndị Moab nʼoge ahụ,

5zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị, “Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m.

6Ugbu a, bịa ka ị bụọrọ m ha ọnụ, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ma eleghị anya aga m enwe ike merie ha, ma chụpụkwa ha site nʼala m. Nʼihi na amaara m na ndị ọbụla ị gọziri bụ ndị a gọziri agọzi, ndị ọbụla ị bụrụ ọnụ ga-anọgide bụrụ ndị a bụrụ ọnụ.”

7Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.