24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
25Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
26Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
27Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
28Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.