4Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
5Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
6Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.
7Nke a bụ ozi Belam ziri: “Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m. Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m. Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ bịa kwutọọ Izrel.
8M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?