7Nke a bụ ozi Belam ziri: “Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m. Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m. Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ bịa kwutọọ Izrel.
8M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
9Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha. Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ, hụ na ha bụ ndị biri onwe ha, ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ.
10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị? Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị. Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume. Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
11Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”