2Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile.
3Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha.
4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.”
5Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.”
6Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.