Ọnụọgụgụ 25

Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị.

Numbers 25:9 (UKJV) And those that died in the plague were twenty and four thousand.

7Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya,

8soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị.

9Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị.

10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

11“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.