32Ikwu Shemida, site na Shemida, ikwu Hefa, site na Hefa.
33(Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.)
34Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa (52,700).
35Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị: ikwu Shutela site na Shutela, ikwu Beka site na Beka, ikwu Tahan site na Tahan.
36Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela: ikwu Eran site na Eran.