Ọnụọgụgụ 27

Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,

Numbers 27:1 (UKJV) Then came the daughters of Zelophehad, the son of Hepher, the son of Gilead, the son of Machir, the son of Manasseh, of the families of Manasseh the son of Joseph: and these are the names of his daughters; Mahlah, Noah, and Hoglah, and Milcah, and Tirzah.

1Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,

2nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,

3“Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.