11Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ”
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.
13Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
14Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
15Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,