21Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
22Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
23Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.