6Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
7“Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
8“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị.
9Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke.
10A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.