19Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
20“ ‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
21Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
22Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
23“ ‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.