24Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
25Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
26“ ‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
27Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
28Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.