28Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
29“ ‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
30Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
31Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
32“ ‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.