38Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
39“ ‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’ ”
40Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.