12“Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m.
13Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.”
14Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya,
15“Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
16Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.