Ọnụọgụgụ 3

Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.

Numbers 3:29 (UKJV) The families of the sons of Kohath shall pitch on the side of the tabernacle southward.

27Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat.

28Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.

29Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.

30Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.

31Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.