Ọnụọgụgụ 31

Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a.

Numbers 31:18 (UKJV) But all the women children, that have not known a man by lying with him, keep alive for yourselves.

16Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke Onyenwe anyị.

17Ugbu a, gbuonụ ụmụnta ndị nwoke niile, na ndị inyom niile matarala nwoke.

18Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a.

19“Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa.

20Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.