41Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja Onyenwe anyị oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
42Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha.
43Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise (337,500),
44igwe ehi, iri puku atọ na isii (36,000),
45ịnyịnya ibu, iri puku atọ na narị ise (30,500),