10Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
11‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’
12Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz, na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
13Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
14“Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.