Ọnụọgụgụ 32

Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.

Numbers 32:33 (UKJV) And Moses gave unto them, even to the children of Gad, and to the children of Reuben, and unto half the tribe of Manasseh the son of Joseph, the kingdom of Sihon king of the Amorites, and the kingdom of Og king of Bashan, the land, with the cities thereof in the coasts, even the cities of the country round about.

31Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.

32Anyị ga-ejikere soro Onyenwe anyị jee agha nʼala Kenan. Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọdan.”

33Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.

34Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea

35Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.