37Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm.
38Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.
39Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
40Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
41Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.