46Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
47Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
48Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
49Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
50Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,