17“Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
18Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
19“Ndị a bụ aha ndị a họpụtara: “Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
20Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
21Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.