3“ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,
4gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,
5ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
6Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
7Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.