6Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
7Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.
8Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad,
9ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
10Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.